Ukochukwu Ebeebe Lyrics
- Genre:Gospel
- Year of Release:2022
Lyrics
Ị bụ ụkọchukwu ebighịebi (turu! turu!)
N'usoro nke Melkizedek mgbe ochie (turu! turu ugo!)
Ị bụ ụkọchukwu ebeebe (n'ezie)
N'usoro nke Melkizedek
N'usoro nke Melkizedek
N'usoro Melkizedek! Melkizedek!
Melkizedek mgbe ochie
Goribe na Ị bụ ụkọchukwu ebeebe
N'usoro nke Melkizedek
Melkizedek!
Chukwu añụgo iyi!
Ọ gaghị añụghasị!
Onyenweanyị Chineke ahọrọla gị ijere ya ozi
Nwanne m egwu atụla gị
Onyenweanyị Chineke nọnyeere gị
Ị bụ ụkọchukwu ebeebe!
Ị bụ ụkọchukwu ebighịebi (turu! turu!)
N'usoro nke Melkizedek mgbe ochie (turu! turu ugo!)
Ị bụ ụkọchukwu ebeebe (n'ezie)
N'usoro nke Melkizedek
N'usoro nke Melkizedek
N'usoro Melkizedek! Melkizedek!
Melkizedek mgbe ochie
Goribe na Ị bụ ụkọchukwu ebeebe
N'usoro nke Melkizedek
Melkizedek!
Ọ dịghị onye na-ewelu ọrụ a n'ike aka ya
Ọtụtụ ka a kpọrọ ma olemole ka a họọrọ
Ọ kwa Chi na-akpọ, Chi na-ahọrọ,Chi na-eziga!
Onyenweanyị Chukwu ahọrọlọ Gị nwanne m
Ñụriba!
Ị bụ ụkọchukwu ebighịebi (turu! turu!)
N'usoro nke Melkizedek mgbe ochie (turu! turu ugo!)
Ị bụ ụkọchukwu ebeebe (n'ezie)
N'usoro nke Melkizedek
N'usoro nke Melkizedek
N'usoro Melkizedek! Melkizedek!
Melkizedek mgbe ochie
Goribe na Ị bụ ụkọchukwu ebeebe
N'usoro nke Melkizedek
Melkizedek!
Ị bụghịzikwa mmadụ nkịtị, aka Chineke dị gị n'ahụ
Ị bụzikwa ọkara mmadụ, ọkara mmụọ eh!
Yọtaara anyị Chukwu ayịyọ n'aja Missa
Ị bụ ụkọchukwu ebeebe!
Ị bụ ụkọchukwu ebighịebi (turu! turu!)
N'usoro nke Melkizedek mgbe ochie (turu! turu ugo!)
Ị bụ ụkọchukwu ebeebe (n'ezie)
N'usoro nke Melkizedek
N'usoro nke Melkizedek
N'usoro Melkizedek! Melkizedek!
Melkizedek mgbe ochie
Goribe na Ị bụ ụkọchukwu ebeebe
N'usoro nke Melkizedek
Melkizedek!