![Nara Ekele](https://source.boomplaymusic.com/group10/M00/02/02/861a7e9ad2ef485b9b693ab967855d20_464_464.jpg)
Nara Ekele Lyrics
- Genre:Gospel
- Year of Release:2024
Lyrics
Chukwu Onye dị ike
Chukwu Onye dị nsọ
Chukwu dị ebube
E soro amara ụzọ mo
Oge eruwo mgbe anyị ji enye Gị ekele
Bịa nara ekele mo
Eze mo! nara ekele mo
Nara, nara, nara
Nara ekele mo (Nara ekele mo!)
Nara otito Chukwu (Nara otito mo, Nna!)
Nara, nara, nara (Nara ya Chukwu ọma mo!)
Nara ya Chukwu, eze mo (Nara ya Chukwu ọma mo!)
Chukwu mo, nara ya n'o ruuru Gị o
Chukwu Ọkasị akasị
Chukwu na-eburu m agha zoro ezo
Chukwu na-agwọ m ọrịa na-anaghị ego
Oke Chi m; Mmụọ ka mmụọ
Aga m akọwa ole ghara ole
Bụ mmeso ọma Gị na ndụ m
Aga m akọwa kọwa kọwa kọwa
Kọwa kọwa kọwa kọwa ole ghara ole
Bụ mmeso ọma Gị na ndụ mo
Gi Onye na-ekwe nkwa mezuo nkwa Gị
Aga m akọrọ ụmụ ụwa, ihe I na-emere mo
Nara ekele mo!
Nara, nara, nara
Nara ekele mo (Nara ekele mo!)
Nara otito Chukwu (Nara otito mo, Nna!)
Nara, nara, nara (Nara ya Chukwu ọma mo!)
Nara ya Chukwu, eze mo (Nara ya Chukwu ọma mo!)
Chukwu mo, nara ya n'o ruuru Gị o
Chukwu Onye bi n'igwe
Gịnị ka m ga-enye Gị, Nna m
Ka o wee zuoro Gị, maka ihe ọma I na-emere mo
N'ezie, onyinye anyị na-enye Gị o
Abụghịkwa i ji kwụọ Gị ụgwọ
Maka mmeso ọma Gị n'ime ndụ mo, Nna m
Chukwu enweghị m ọlaọcha e
E nweghị m ọlaedo
Nke m ga-enye Gị Chi m ọma
Maka ihe ọma I na-emere mo!
Ihe m ji bịa bụkwa abụ ekele
Ihe m ji bịa bụkwa abụ otito
Isiala, na ikpereala; Ọ bụ Gị nwe ya
Isiala n'ọbu Gị nwe ya
Ikpereala n'ọbụ Gị nwe ya
Ana m achiniri Gị aka elu o
Sị Gị: Nna m, daalụ o
Iye iye iye iye
Oh
Nara ekele mo
Nara otito mo
Asị na arụ m bụ sọ ọnụ eh
Ozughị inye Gị ekele
Nara ekele mo
N'ọbụ Gị nwe ya
Iye iye iye iye
Chukwu nara ekele
Chukwu nara otito
Isiiyi nke ndụ m
Nwanne otu onye
Odogwu akataka
Eh na Amen
Onye mmeri
Chi a na-akpọ ofu ugboro O za ugboro asaa
Ikuku mbekumbe mo
Okokomikoomi
Onyeọma mo
Onye na-edu ije
Ezi Chimo
Oke Mmụọ
Oke Chi
Mmụọ ka mmụọ
Onye na-enye ndụ
Onye na-enye akụ
Onye na-enye nwa
Onye na-agwọ ọrịa
Onyeọma mo, nara ekele mo!
Nara otito mo!
Isiala n'ọ bụ Gị nwe ya
Ikpereala n'ọbụ Gị nwe ya
Chukwu nara ekele m jiri bịa o
(Nara ya n'o ruuru Gị o)
Eze nara otito m jiri bịa o
(Nara ya n'o ruuru Gị o)
Biko nara ya n'ọbụ Gị nwe ya
(Nara ya n'o ruuru Gị o)