Chidozie Lyrics
- Genre:Gospel
- Year of Release:2023
Lyrics
Dozie! Dozie! Chidozie!
Chukwudozie, Chukwu nọ n'Oriri Nsọ
Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata
Gbanwoo mo!
Sachaa mo!
Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata
Doo m nsọ
O Onyendozi!
Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata
Doo m nsọ
O Onyendozi!
Ike agwụgo mo!
Ike agwụgo mo!
Ike agwụgo mo, imejọzi Gị Jesu mo!
Werenụ amara Gị jidesienụ m ike
Dozie ndụ m, ka m bụrụ nke Gị o!
Chukwu
Dozie! Dozie! Chidozie!
Chukwudozie, Chukwu nọ n'Oriri Nsọ
Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata
Gbanwoo mo!
Sachaa mo!
Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata
Doo m nsọ
O Onyendozi!
Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata
Doo m nsọ
O Onyendozi!
O teela m chọbara ka m na Gị dozie
Ma ụtọ njọ ekweghi m ka m kwụdosie ike
Nyerenụ m aka ka m mebe uche Gị
Belatara m oliwarawara, oliwarawara nke njọ
Chukwu
Dozie! Dozie! Chidozie!
Chukwudozie, Chukwu nọ n'Oriri Nsọ
Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata
Gbanwoo mo!
Sachaa mo!
Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata
Doo m nsọ
O Onyendozi!
Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata
Doo m nsọ
O Onyendozi!
Mgbe ebili mmiri nke ụwa na-efegharị m
Mgbe ọnwụnwa nke ụwa na-atụgharị m
Jidesienụ m ike!
Jidesienụ m ike!
Ka m ghara ịda
Chukwu na-edozi ihe niile!
Chukwu
Dozie! Dozie! Chidozie!
Chukwudozie, Chukwu nọ n'Oriri Nsọ
Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata
Gbanwoo mo!
Sachaa mo!
Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata
Doo m nsọ
O Onyendozi!
Ka Ahụ na Ọbara Gị m na-anata
Doo m nsọ
O Onyendozi!
Dozienụ mo, O Onyendozi!
Dozienụ mo, O Onyendozi!
Dozie mo! Dozie!
Chukwu dozie; mee m ka m mara Gị
Olisa dozie ife na-esere anyị o!
Dozienụ ndụ mo!
Nyenụ m ndụ ohuru!
Dozienụ ndụ mo!
Onye I doziri, o nwee mgbanwe
O kwa Gị doziri ndụ Meri Magdalịn?
O kwa Gị doziri ndụ nwanyị oruru ọbara?
Zakịọs zutere Gị; I nye ya nzọpụta
Sọl zutere Gi; I gbanweere ya aha
Nwanyị Sameria zutere Gị o!
I gbanweere ya ọnọdụ
Lezianụ mo, Chimo!
Lezianụ mo, Chimo!
Dozienụ mo, O Onyendozi!
Dozienụ mo, O Onyendozi!