Chukwuemeka Lyrics
- Genre:Gospel
- Year of Release:2022
Lyrics
Chukwuemekara mo (n'eziokwu)
Bianụ lee ihe Nna m meere mo
Lekene mo!
Abụzikwa m onye ụwa ọma n'ime Chineke
Nna emego m eze!
Nnaemeka! (ka anyị kelee nụ Chineke n'O meka)
Chukwu emekara mo!
Ndị enyi mo!
Soro m kelee Ya!
Eh! n'O meeka!
M kọwa ihe O meere mo!
N'ezie chi ga-eji, chi ga-abọ ma agaghị m akọcha
Aga m akọwa ole wee ghara ole (lekele mo Ị ga-ahu nwanne m)
Bụ mmeso ọma Chukwu na ndụ mo
Soro m kelee Ya eye!
Chukwu emekara mo o o o o o o o o!
Soro m kelee Ya, eye!
N'ezie Chukwu emekara mo!
Karịa ka m tụrụ anya
Ihe ahụ m riọrọ Ya, ọ kwa ya ka O mere tinye ya jara
Bịanụ soro mo k'anyị jee sị Ya n'Omeeka
Soro m kelee Ya eye!
Chukwu emekara mo o o o o o o o o!
Soro m kelee Ya, eye!
N'ezie Chukwu emekara mo!
Karịa ka m tụrụ anya
Ihe ahụ m riọrọ Ya, ọ kwa ya ka O mere tinye ya jara
Bịanụ soro mo k'anyị jee sị Ya n'Omeeka
Mmiri maa ọgazi n'elu, maa ya n'ala
Ezi akịka ya ga-adịrịrị (akara chi ya ga-adịrịrị na-enweghị nhicha)
Leenu mo!
Onye iro bịara ka o gbuo ma laa n'iyi
Na-akpa nkata ka o bo m nnu, hakpo m mmiri n'ime ndụ m
Ma ọ maghị na ide ji ndụ m, Chinaechendo m etunyego m ugo
A bụzikwa m akwa ugo, Ị ma na adịghị awa m awa
Maka na mmiri mara ugo asagokwanụ ugo ahụ
Chukwuemeka!
Soro m kelee Ya eye!
Chukwu emekara mo o o o o o o o o!
Soro m kelee Ya, eye!
N'ezie Chukwu emekara mo!
Karịa ka m tụrụ anya
Ihe ahụ m riọrọ Ya, ọ kwa ya ka O mere tinye ya jara
Bịanụ soro mo k'anyị jee sị Ya n'O meeka
Soro m kelee Ya eye!
Chukwu emekara mo o o o o o o o o!
Soro m kelee Ya, eye!
N'ezie Chukwu emekara mo!
Karịa ka m tụrụ anya
Ihe ahụ m riọrọ Ya, ọ kwa ya ka O mere tinye ya jara
Bịanụ soro mo k'anyị jee sị Ya n'Omeeka
E nye nwata ihe karịrị ya ọ jụba enyere ya nye onye
Gwanụ mo! onye ka m bụzi Chineke ji echere mo
O meka!
Soro m kelee Ya eye!
Chukwu emekara mo o o o o o o o o!
Soro m kelee Ya, eye!
N'ezie Chukwu emekara mo!
Karịa ka m tụrụ anya
Ihe ahụ m riọrọ Ya, ọ kwa ya ka O mere tinye ya jara
Bịanụ soro mo k'anyị jee sị Ya n'Omeeka
Soro m kelee Ya eye!
Chukwu emekara mo o o o o o o o o!
Soro m kelee Ya, eye!
N'ezie Chukwu emekara mo!
Karịa ka m tụrụ anya
Ihe ahụ m riọrọ Ya, ọ kwa ya ka O mere tinye ya jara
Bịanụ soro mo k'anyị jee sị Ya n'O meeka
Iye iye iye soro mo!
Ka anyị jee tụọrọ Ya mma mma
Chukwu emeka, nwanne m soro mo!
Iye iye iye soro mo!
Ka anyị jee tụọrọ Ya mma mma
Chukwu emeka! (ndị enyi m soro nu mo!)
Bịanu lee!
Bịanu lee-lele-lele-lelee!
Bịanụ lele mo! ihe ọñụ emeela!
Ọnụ m juru n'ekele!
Olisa emeka!
Ihe ahụ m riọrọ Ya
Ọ kwa ya k' O mere tinye ya jara
Bịanụ soro mo!
Ka anyị jee si Ya n' O meeka!
Soro m kelee Ya eye!
Chukwu emekara mo o o o o o o o o!
Soro m kelee Ya, eye!
N'ezie Chukwu emekara mo!
Karịa ka m tụrụ anya
Ihe ahụ m riọrọ Ya ọkwa ya ka O mere tinye ya jara
Bịanụ soro mo k'anyị jee sị Ya n'Omeeka
Soro m kelee Ya eye!
Chukwu emekara mo o o o o o o o o!
Soro m kelee Ya, eye!
N'ezie Chukwu emekara mo!
Karịa ka m tụrụ anya
Ihe ahụ m riọrọ Ya ọkwa ya ka O mere tinye ya jara
Bịanụ soro mo k'anyị jee sị Ya n' Omeeka