Igbo Enwe Exe Lyrics
- Genre:Afrobeat
- Year of Release:2022
Lyrics
ejerum ikpe na obodo ụmụ anụ
mụ na ndị elu na ndị ala
anyanwụ nọ na aka nri
Ana nọ m na aka ekpe
na nwa nje ozi bụ ikuku
ọ bụ ya kwụ na ọnụ ụzọ
ekwute anụ ga abụ eze
ebe nile ana ada ghara ghara
ka ha so jebe izu na ala mmụọ
weru na ekete oke n obi Chukwu
ha sị na Nchi na ebu ayụ
sị na edi na eri aja
akụm na etiwa ụgbọ
atụ bụ nkwuruwa obi
odụmọdụ na egbu agụ
ma aghụghụ chụpụrụ ọdụm ebe obi
ọnwa na égbè na ezu ohi
egbucha fa egbu na anya dị ha n ọkụkọ
ha gwara ọkịrị na onye akụkọ bụ onye ama
na ọ gaghị agbara ekpelima afa
ha sị na ugo na eri agwọ
agbọghọ tara akara afịa na ugwu ya adakwana
kedu anụ ga abụ eze
na ọ bụ akana ga abụ eze
udene beru be onye ukwu na onye nta
ụfọdụ na amụ amụ
ụfọdụ na ebe uria
asị na akana na eri ozu
ka akpọ́nite mbedi ọgụ onye isi amamihe akpọ ya ogwumagana
tuo ya